Numbers 34

Oke ala na Kenan

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:

3“ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu, 4gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn, 5ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
6Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor. 8Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad, 9ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
10Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam. 11Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili. 12Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu.

“ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”

13Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ. 14Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha. 15Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”

16 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 17“Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun. 18Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.

19“Ndị a bụ aha ndị a họpụtara:

“Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
20Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
21Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
22Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
23Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
24Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
25Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
26Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
27Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
28Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”

29Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
Copyright information for IboBIU